Ezi-omume, Ime ezi-omume Hụ kwa Ajọọ omume, Omume n’ezighị-ezi; Itozu-oke, Ntozu-oke; Iwu-nsọ nile nke Chineke; Izu-oke; Jee-ije, Soro Chineke jegharịa Izi-ezi, ịdị-nsọ, ezi-omume, ịkwụ-ọtọ; ime omume na nrube-isi nye iwu nile nke Chineke, izere mmehie. Onye-nwe ga-agọzi onye ezi-omume, Abụọma 5:12. Anya nile nke Onye-nwe dị n’arụ nke ndị ezi-omume, Abụọma 34:15, 17 (1 Pita 3:12). Mgbe ndị ezi-omume na-achị achị, ndị mmadụ na-an̄ụrị, Ilu 29:2 (OznỌd. 98:9–10). Ngọzi na-adịrị ndị agụụ ezi-omume na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ na ya, Mat. 5:6 (3 Nif. 12:6). Buru ụzọ chọọ ala-eze Chineke na ezi-omume ya, Mat. 6:33. Ndị ezi-omume ga-aba na ndụ ebighi-ebi, Mat. 25:46. Ekpere dị ike nke onye ezi-omume na-arụsị ọrụ ike, Jemes 5:16. Onye ahụ bụ onye ezi-omume ka Chineke na-emere omume afọ-ọma, 1 Nif. 17:35. Ọ ga-echekwa ndị ezi-omume; ha ekwesịghị ịtụ egwu, 1 Nif. 22:17, 22. N’ihi ezi-omume nke ndị nke Onye-nwe, Setan a gaghị enwe ike obụla, 1 Nif. 22:26. Ọ bụrụ n’ezi-omume adịghị an̄ụrị adịghị, 2 Nif. 2:13. Ndị ezi-omume ga-eketa ala-eze nke Chineke, 2 Nif. 9:18. Ndị ezi-omume anaghị atụ egwu okwu nile nke ezi-okwu, 2 Nif. 9:40. Ndị mmadụ nile ka a ga-agbanwe baa n’ọnọdụ nke ezi-omume, Mosa. 27:25–26. Aha nile nke ndị ezi-omume a ga-ede ha n’ime akwụkwọ nke ndụ, Alma 5:58. Unu achọwo inweta an̄ụrị site n’ime ajọọ-omume, bụ nke na-emegide ụdị okike nke ezi-omume, Hil. 13:38. Abụ nke onye ezi-omume bụ ekpere nye m, OznỌd. 25:12. Guzonụ, yirikwa epekele nchekwa-obi nke ezi-omume, OznỌd. 27:16 (Ndị-Efe. 6:14). Ọnwụ nke ndị ezi-omume ga-adị ụtọ nye ha, OznỌd. 42:46. Ndị ezi-omume ka a ga-akpọkọta site n’etiti mba nile, OznỌd. 45:71. Ndị mmadụ kwesịrị iweta na mmezu nnukwu ezi-omume site n’ọchịchọ nke onwe ha, OznỌd. 58:27. Onye ahụ na-arụ ọrụ nke ezi-omume ga-anata udo n’ime ụwa nke a na ndụ ebighi-ebi n’ụwa nke na-abịa, OznỌd. 59:23. N’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, nkewapụ nke ndị ezi-omume na ndị ajọọ mmadụ ga-adị, OznỌd. 63:54. Ike nile nke elu-igwe bụ ihe a ga-atụzi aka na ya site n’ụkpụrụ nile nke ezi-omume, OznỌd. 121:36. N’etiti ndị ezi-omume ka udo dị, OznỌd. 138:22. Ndị mmadụ nke Zaịọn biiri n’ezi-omume, Moses 7:18. Abraham abụrụwo onye na-eso ezi-omume, Abr. 1:2.