Ikwụtọ Ikwuhie Hụ kwa Ikwuhie Chineke, Nkwuhie Chineke Enyeghị nsọpụrụ ma-ọbụ nleli maka ihe nile dị nsọ; nke ka nke enyeghị nkwanye ugwu maka aha nke Chineke. Gị ejila aha Onye-nwe bụ Chineke gị ime ihe-efu, Ọpụ. 20:7 (2 Nif. 26:32; Mosa. 13:15; OznỌd. 136:21). Gịnị mere anyị ji na-eme ka ọgbụgba-ndụ nna anyị ha ghara ịdị-nsọ? Mal. 2:10. Okwu ọbụla mmadụ ga-ekwu nke na-abaghị n’ihe, ha ga-enye nkọwasị banyere ya n’ụbọchị ikpe, Mat. 12:34–37. Site n’otu ọnụ ahụ ka ngọzi na ọbụbụ-ọnụ si pụta, okwesịghị ka ọdị otu a, Jemes 3:10. Okwu anyị nile ga-ama anyị ikpe, Alma 12:14 (Mosa. 4:30). Ka mmadụ nile kpachara anya otu ha si akpọku aha m n’egbugbere ọnụ ha, OznỌd. 63:61–62.