Ịdabere n’ihe nke ụwa Hụ kwa Efu, Ihe-efu; Ego; Mpako; Ụba aku Ọchịchọ nile na-ezighị-ezi na mgbalị nile maka ụba-akụ nile nke ụwa na ihe onwunwe nile a na-ahụ anya ma na-ahapụ ihe nile nke mụọ. N’ihi na uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, ma o bụrụ na ọ ga-erita ụwa dum n’uru ma mkpụrụ-obi ya e funarị ya, Mat. 16:26. Ha tinyere obi ha nile n’ihe efu nile nke ụwa, Alma 4:8 (Alma 31:27). Tụpụ kwa ihe nile nke ụwa nke a, OznỌd. 25:10. Obi ndị mmadụ ka a tụkwasịrị karịa n’elu ihe nile nke ụwa nke a, OznỌd. 121:35.