Otu osisi dị n’ime ogige-ubi Iden na paradaịs nke Chineke (Jen. 2:9 ; Mkpu. 2:7 ). N’ime nrọ Lihaị osisi nke ndụ nọchitere-anya ịhụnanya nke Chineke ma a na-atụnyere ya dịka onyinye nile kachasị n’ime onyinye nke Chineke (1 Nif. 8 ; 11:21–22, 25 ; 15:36 ).
Lihaị wee hụ osisi nke ndụ ahụ, 1 Nif. 8:10–35 .
Nifaị hụrụ osisi ahụ nke nna ya hụrụ, 1 Nif. 11:8–9 .
Okporo igwe ahụ duuru ruo n’osisi nke ndụ, 1 Nif. 11:25 (1 Nif. 15:22–24 ).
Olulu dị egwu kewara ndị ajọọ omume site n’osisi nke ndụ ahụ, 1 Nif. 15:28, 36 .
Ọ ga-adịrịrị mkpa na e nwere mkpụrụ-osisi a sị erila na mmegide nke osisi nke ndụ ahụ, 2 Nif. 2:15 .
Bịakwute Onye-nwe ma unu ga-aracha site na mkpụrụ nke osisi nke ndụ, Alma 5:34, 62 .
Ọ bụrụ na nne na nna anyị mbụ rachara mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ha gaara anọ n’ọnọdụ nhụju anya ruo mgbe nile, Alma 12:26 .
Ọ bụrụ na unu agaghị azụ okwu ahụ, unu enweghị ike ịghọta mkpụrụ nke osisi nke ndụ ahụ, Alma 32:40 .
Onye-nwe kụrụ osisi nke ndụ n’etiti ogige ubi ahụ, Moses 3:9 (Abr. 5:9 ).
Chineke zipụrụ Adam site na Iden ka ọ ghara ịracha site na osisi nke ndụ ma dị ndụ ruo mgbe nile, Moses 4:28–31 .