Mmehie Hụ kwa Ajọọ omume, Omume n’ezighị-ezi; Ajọọ, Ajọọ omume; Ihe rụrụ arụ, Ihe-arụ; Inyi, Iru-inyi; Mejọọ; Ndụ n’eyighị Chineke; Nnupụ-isi Ịkpachara anya ghara irube isi nye iwu nsọ nile nke Chineke. Onye na-ekpuchi mmehie ya, o gaghị eme nke ọma, Ilu 28:13. Ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dịka akụ mmiri igwe ka ha ga-adị ọcha, Aịsa. 1:18. Ndị mmehie ga-anwụ, ma ndị ezi-omume ka a ga-azọpụta, Ezik. 18. Nwa-atụrụ nke Chineke na-ebupu mmehie nile nke ụwa, Jọn 1:29. Ka e mee gị baptism, sachapụ kwa mmehie gị nile, Ọlndoz. 22:16. Ụgwọ ọrụ nile nke mmehie bụ ọnwụ, Ndị-Rom 6:23. Onye maara ime ihe ọma, ma o meghị ya ọ bụụrụ onye ahụ mmehie, Jemes 4:17. Ị ga-eme m ka m ma jijiji na mpụta-ìhè nke mmehie, 2 Nif. 4:31. Ahụhụ na-adịrị ndị nile na-anwụ n’ime mmehie ha nile, 2 Nif. 9:38. Ha enweghị ike ilekwasị mmehie anya ma-ọbụghị nanị na-ịkpọ nnukwu asị, Alma 13:12. Echekwala na a ga-ewetaghachi gị site na mmehie ruo n’an̄ụrị, Alma 41:9–10. Onye-nwe enweghị ike iji inye-ohere kachasị-ntakịrị lekwasị mmehie anya, Alma 45:16 (OznỌd. 1:31). Ụmụ-ntakịrị enweghị ike ime mmehie, Moro. 8:8. Ọ bụrụ na mmadụ ga-echegharị, ha ga-ekwupụta ma hapụ mmehie ha nile, OznỌd. 58:42–43. N’ime ya ka mmehie dị ukwuu karịa dị bụ onye na-agbagharaghị nwanne ya, OznỌd. 64:9. Onye ahụ nke ga-eme mmehie megide ìhè ahụ dị ukwuu karịa, ga-anata amamikpe dị ukwuu karịa, OznỌd. 82:3. Nye mkpụrụ-obi ọbụla nke mehiere ka mmehie nile ndị mbụ ga-alaghachikwute, OznỌd. 82:7. Mgbe anyị nakweere ikpuchi mmehie anyị nile, elu-igwe nile na-ewezuga onwe ha, OznỌd. 121:37.