Nrịrịa, Onye-nrịrịa, Ọrịa Inwe nrịrịa ma-ọbụ ọrịa. N’ime akwụkwọ-nsọ nile, ọrịa nke arụ oge nile ụfọdụ na-abụ otu àkàrá nke e nweghị ọdịmma nke mụọ (Aịsa. 1:4–7; 33:24). Anụwo m ekpere gị, a hụwo m anya-mmiri gị, lee, m ga-eme ka arụ gị dị ike, 2 Ndez. 20:1–5 (2 Ihem. 32:24; Aịsa. 38:1–5). Jisus wee na-ejegharị na-agwọ ọrịa nile dị iche iche na nrịrịa nile dị iche iche, Mat. 4:23–24 (1 Nif. 11:31; Mosa. 3:5–6). Mkpa dibịa akpaghị ndị dị ike, kama ọ na-akpa ndị na-arịa ọrịa, Mat. 9:10–13 (Mak 2:14–17; Luk 5:27–32). Ọ dị onye ọbụla n’etiti unu arụ na-adịghị ike? Ya kpọọ ndị okenye, Jemes 5:14–15. Kraịst ga-ebukwasị onwe ya ihe mgbu nile na ọrịa nile nke ndị ya, Alma 7:10–12. Jisus gwọrọ ndị ọrịa nile nọ n’etiti ndị Nifaị, 3 Nif. 26:15. Jiri obi-nro, ahịhịa nile, na nri dị nro zụọ onye-ọria, OznỌd. 42:43 (Alma 46:40). Cheta n’ime ihe nile ndị nrịrịa na ndị nwere mkpagbu, OznỌd. 52:40. Bịkwasị ndị ọrịa aka gị nile, ma a ga-eme ka arụ dị kwa ha ike ọzọ, OznỌd. 66:9.