Ohere-ịhọrọ Hụ kwa Inwere-onwe, Nnwere-onwe; Inye nkọwasị, Nkọwasị, Nwe nkọwasị Ike ime ihe na ọhere Chineke na-enye ndị mmadụ ịhọrọ na mee omume nye onwe ha nile. Site n’osisi nile ka i nwere ike iri, Jen. 2:16. Mmadụ enweghị ike iji aka ya mee ihe ọ chọrọ ma ọbụghị ma otu ihe toro ya akpịrị, 2 Nif. 2:15–16. mmadụ nwere ike ịhọrọ inwere onwe ha na ndụ ebighi-ebi ma-ọbụ ndọkpụ n’agha na ọnwụ, 2 Nif. 2:27. Unu nwere onwe unu; e nyere unu ohere imere onwe unu otu unu chọrọ, Hil. 14:30. Otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ụsụụ ndị agha nke elu-igwe ka ọ tụgharịrị pụọ imegide m n’ihi nhọrọ ha, OznỌd. 29:36. Ọdị mkpa na Ekwensu ga-anwa ndị mmadụ ọnwụnwa, ma-ọbụ ha agaghị abụ ndị nweere onwe ha, OznỌd. 29:39. Ka nwoke ọbụla họrọ nke onwe ya, OznỌd. 37:4. Ka mmadụ nile jee ije n’ozizi na ụkpụrụ metutara ọdị n’iru dika ohere nhọrọ nke m nyeworo ya siri dị, OznỌd. 101:78. Setan chọrọ ka o bibie ohere nhọrọ nke mmadụ, Moses 4:3. Onye-nwe nyeworo mmadụ ohere nhọrọ ya, Moses 7:32.