Ọkụ Hụ kwa Ala-mụọ; Baptism, Mee Baptism; Mụọ Nsọ; Ụwa—Isacha ụwa Akara nke ime ka ihe dị ọcha, ịsacha ma-ọbụ ido ihe nsọ. Ọkụ nwekwara ike bụrụ akara nke iru Chineke. Chineke gị bụ ọkụ na-eripịa eripịa, Deut. 4:24. Onye-nwe na-eme ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ọkụ na-enwu enwu, Abụọma 104:4. Onye-nwe nke ụsụụ n’ile nke ndị-agha ga-eji ire nke ọkụ nrepịa leta ha, Aịsa. 29:6 (2 Nif. 27:2). Onye-nwe ga-eji ọkụ bịa, Aịsa. 66:15. Ọ dị ka ọkụ onye mmezi-ọla, Mal. 3:2 (3 Nif. 24:2; OznỌd. 128:24). Ọ ga-eji Mụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptism, Mat. 3:11 (Luk 3:16). A ga-echekwa ndị ezi-omume site n’ọkụ, 1 Nif. 22:17. A ga-ebibi ndị ọjọọ site n’ọkụ, 2 Nif. 30:10. Nifaị wee kọwaa otu anyị ga-esi anata baptism nke ọkụ na nke Mụọ Nsọ, 2 Nif. 31:13–14 (3 Nif. 9:20; 12:1; 19:13; Ita 12:14; OznỌd. 33:11). Ị ga-ekwupụta nsacha nke mmehie nile site na-ime baptism, na site n’ọkụ, OznỌd. 19:31. Nnukwu nzukọ na nke ihe arụ ahụ ka-a ga-akwatu site n’ọkụ na-erepịa, OznỌd. 29:21. Ụwa ga-agafe otu ahụ dịka site n’ọkụ, OznỌd. 43:32. Iru nke Onye-nwe ga-abụ dịka ọkụ na-agbaze agbaze, OznỌd. 133:41. E mewo Adam baptism jiri ọkụ na Mụọ Nsọ, Moses 6:66.