Ntụkwasị-obi Hụ kwa Nchekwube; Okwukwe Ị dabere n’elu ma-ọbu debe nchekwube n’ime otu onye ma-ọbu ihe ụfọdụ. N’ihe nile nke mụọ ntụkwasị-obi gụnyere ị dabere na Chineke na Mụọ ya. Ọbụrụgodu na ọ ga-egbu m aga m atụkwasị ya obi, Job 13:15. Tụkwasị Onye-nwe obi jiri obi gị nile, Ilu 3:5. Chineke napụtara ndị odibo ya ndị tụkwasịrị ya obi, Dan. 3:19–28. Aga m atụkwasị gị obi ruo mgbe nile, 2 Nif. 4:34. N̄ụrịa ma tinye ntụkwasị-obi unu na Chineke, Mosa. 7:19. Onye ọbụla tinyere ntụkwasị obi ya na Chineke ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ikpe-azụ, Mosa. 23:22. Ndị nile ga-etinye ntụkwasị-obi ha na Chineke ka a ga-akwado n’ime mnwale ha, Alma 36:3, 27. A tụkwasịla obi n’aka nke anụ arụ, OznỌd. 1:19. Tinye ntụkwasị-obi gị na Mụọ ahụ nke na-eduba n’ime ihe ọma, OznỌd. 11:12. Ka ọ tụkwasị obi na m ma ọ gaghị enwe mgbagwọju-anya, OznỌd. 84:116.