Onye-ogbugbo Hụ kwa Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie; Jisus Kraịst Onye na-arịọ maka ma-ọbụ onye nọ n’etiti. Jisus Kraịst bụ Onye-ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ. Aja mgbaghara mmehie ya mere ka okwe omume maka ndị mmadụ ichegharị site na mmehie ha nile na mee udo ha na Chineke. Ọdịghị onye ọbụla na-abịakwute Nna ahụ ma-ọbụghị site na Jisus Kraịst, Jọn 14:6. Otu Onye-Ogbugbo dị n’agbata Chineke na mmadụ, 1 Tim. 2:5. Kraịst bụkwa Onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ka mma, Ndị-Hib. 8:6 (Ndị-Hib. 9:15; 12:24; OznỌd. 107:19). Mesaia ahụ dị Nsọ ga-arịọta arịrịọ maka ụmụ nile nke mmadụ, 2 Nif. 2:9 (Aịsa. 53:12; Mosa. 14:12). Unu ga-elekwasị nnukwu Onye-ogbugbo ahụ anya, 2 Nif. 2:27–28. A na-eme ka anyị zuo oke site na Jisus onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ, OznỌd. 76:69.