Were n’ụzọ dị elu maka Hụ kwa Nnukwu-ugwu; Nsọpụrụ Ile mmadụ ma-ọbụ ihe anya dịka ọ pụtara ihe ma baa uru, nke ka nke n’ọnọdụ nke ozi-ọma. E ledara ya anya, ma anyị eweghi ya dịka ihe, Aịsa. 53:3–4. Ihe ahụ e weere n’ụzọ dị elu n’etiti mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke, Luk 16:15. Ka onye ọbụla na-ewere ndị ọzọ dị ka ndị ka ha onwe ha mma, Ndị-Fil. 2:3. Onye-nwe weere anụ arụ nile dịka otu, 1 Nif. 17:35. Ka onye ọbụla were onye-agbata obi ya ka onwe ya, Mosa. 27:4 (OznỌd. 38:24–25). N’ụbọchị nke udo ha, ha weere ndụmọdụ nke m n’ihe efu, OznỌd. 101:8.