Uche Ike nile gbasara akọ na uche; ike nile nke uche zuru ezu nke echiche. Were obi zuru oke fee ya ofufe na uche dị na njikere, 1 Ihem. 28:9. Were uche gị dum hụ Onye-nwe Chineke gị n’anya, Mat. 22:37. Itinye uche n’ihe nke anụ arụ bụ ọnwụ, itinye-uche n’ihe nke mụọ bụ ndụ ebighi-ebi, 2 Nif. 9:39. Olu nke Onye-nwe batara n’ime uche m, Inọs 1:10. Okwu ahụ nwere nsonazụ kara sie ike n’uche ndị ahụ karịa mma agha, Alma 31:5. Aga m a gwa gị n’ime uche gị, OznỌd. 8:2. I ga-eche-pụta ya n’echiche n’ime uche gị, OznỌd. 9:8. Mee ka ịdị mkpa nke mgbe ebighi-ebi nọrọ n’uche unu nile, OznỌd. 43:34. Uche unu nile n’oge gara aga a bụwo ihe gbara ọchịchịrị, OznỌd. 84:54. Laba n’akwa unu n’oge, bilie n’oge ka arụ unu nile na uche unu nwee ike ọhụrụ, OznỌd. 88:124. Setan amataghị uche Chineke, Moses 4:6. Onye-nwe wee kpọọ ndị ya Zaịọn, n’ihi na ha nwere otu obị na otu uche, Moses 7:18.