Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a Hụ kwa Aha nke Nzukọ-nsọ; Mweghachi nke ozi-ọma; Nzukọ nke Jisus Kraịst; Nzukọ-nsọ, Iriba-ama nile nke ezi-okwu Aha ahụ e nyere Nzukọ-nsọ nke Kraịst n’ụbọchị ndị ikpe-azụ iji mee ka ọ pụta iche site na Nzukọ nsọ ahụ n’ime ọgbọ ndị ọzọ nile (OznỌd. 115:3–4). Onye-nwe ga-awụsa mmụta n’isi ndị nsọ nke Ụbọchị-Ikpeazụ a, OznỌd. 121:33. Joseph Smith bụ onye-amụma na ọhụ-ụzọ nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, OznỌd. 127:12. Nnukwu ụbọchị nke Onye-nwe a dịwo nso maka ndị nsọ ụbọchị-ikpeazụ, OznỌd. 128:21, 24. Joseph Smith enyewo aka ịkpọkọta ndị-nsọ nke ụbọchị-ikpeazụ, OznỌd. 135:3. Ọgbakọ nile nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a ka a ga-ahazi n’ihi ịga njem ruo obodo mpaghara Ọdịda-anyanwụ nke United States nile, OznỌd. 136:2. Iwu nile nke ọlụlụ di na nwunye ka e mere ka ha doo anya maka Ndị-nsọ nile nke Ụbọchị-Ikpeazụ a, OznỌd. IỌỤ—1. A na-enye ndị nwoke nile tozuru oke, bụ ndị otu nke Nzukọ-nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, OznỌd. IỌỤ—2. Nkọwasị nke Ọhụ nke Mbụ nye Ndị-nsọ nile nke Ụbọchị-Ikpeazụ a, A—JS 1:1.