Itozu-oke, Ntozu-oke Hụ kwa Ezi-omume, Ime ezi-omume Ị bụ onye ezi-omume nke onwe na iguzo bụrụ onye a nabatara nke ọma n’anya nke Chineke na ndị ndu ya nile o nyere ọkwa. Onye na-ewereghị obe ya adịghị etozu-oke maka m, Mat. 10:38. Onye-ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya, Luk 10:7 (OznỌd. 31:5). Hụ na unu mere ihe nile n’itozu-oke, Mọm. 9:29. Emeghị ha baptism ma obụghị ma ha tozuru-oke, Moro. 6:1. Onye ume-ngwụ, a gaghị agụ ya n’ikwesị ekwesị iguzo, OznỌd. 107:100. Onye ahụ nke na-agaghị anagide ịta ahụhụ e tozughị oke nye ala-eze nke m, OznỌd. 136:31. Ọkwa nchụ-aja ka e mere ka o rute ndị nwoke nile tozuru-oke, OznỌd. IỌỤ—2.