Ogo nile nke ebube Hụ kwa Ebube Selestịal; Ebube Telestial; Ebube Terrestrial Ala-eze nile dị iche n’elu-igwe. Na ngwụcha ikpe, onye ọbụla ka a ga-enye ebe obibi ebighi-ebi n’ime otu ala-eze n’ụdị nke ya n’otuto, ewezuga ndị ahụ bụ ụmụ ndịkom nke Ila n’Iyi. Jisus wee sị, N’ime ụlọ nna m ọtụtụ ebe obibi dị, Jọn 14:2 (Ita 12:32). Otu ebube nke anyanwụ dị, nke ọzọ nke ọnwa dịkwa, nke ọzọ nke kpa-kpa-ndo nile dịkwa, 1 Ndị-Kọ 15:40–41. E weliri Pọl na mberede ruo elu-igwe nke atọ, 2 Ndị-Kọ 12:2. E nwere otu ebe ebube na-adịghị ma ntaram-ahụhụ ya di ruo mgbe nile na-adigide, OznỌd. 76:30–38, 43–45. Enwere ogo ebube atọ, OznỌd. 76:50–113; 88:20–32.