Ụdị Ihe ma-ọbụ mmadụ dị mma nn̄omi nke mmadụ nwere ike isoro wee nweta ụfọdụ nsonazụ nile. N’ime akwụkwọ-nsọ nile ụdị na-aputakarị otu ọmụma-atụ nke ibi ndụ n’otu ụzọ ma-ọbụ ụzọ esi ewu ihe. Onye-nwe nyere Israel iwu ka ha wuo ụlọ ofufe na nkwekọrịta nke ụdị nke e gosịrị Moses, Ọpụ. 25. Devid wee nye Solomọn ụdị ihe-atụ nke iwu temple ahụ, 1 Ihem. 28:11–13. N’ime mụ onwe m ka Jisus Kraịst ga-egosi ụdị ihe ilere-anya nye ndị ahụ gaje ikwere na ya, 1 Tim. 1:16. Aga m enye unu ihe nlere-anya ka e wee ghara iduhie unu, OznỌd. 52:14.