Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọkwa nchụ-aja nke Melkizedek


Ọkwa nchụ-aja nke Melkizedek

Ọkwa nchụ-aja Melkizedek bụ ọkwa nchụ-aja nke ka ịdị-elu ma-ọbụ ka ịdị ukwuu. Ọkwa nchụ-aja nke Erọn bụ ọkwa nchụ-aja nke ka ịdị nta. Ọkwa nchụ-aja Melkizedek gụkọtara ọtụghe-ụzọ nile nke ngọzi nile nke mụọ nke Nzukọ-nsọ site na emume nsọ nile nke ọkwa nchụ-aja nke ka ịdị-elu, ike nke ndụ iyi Chineke ka a na-egosipụta nye ndị mmadụ (OznỌd. 84:18–25; 107:18–21).

Chineke buru ụzọ kpughee ọkwa nchụ-aja nke a ka ịdị elu nye Adam. Ndi-isi ezi-na ụlọ nile na ndị amụma nile nime Ọgbọ a Kara-aka nile nwere ikike nke a (OznỌd. 84:6–17). A na akpọ ya na mbụ Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ dịka Usoro nke Ọkpara nke Chineke siri dị. N’ikpe-azụ a bịara mara ya dịka Ọkwa Nchu-aja nke Melkizedek (OznỌd. 107:2–4).

Mgbe ụmụ nke Israel dara n’ibi ndụ rutere ohere nile na ọgbụgba-ndụ nile nke Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek, Onye-nwe wepụrụ iwu ahụ nke ka ịdị-elu ma nye ha ọkwa onye nchụ-aja ka ịdị nta na iwu nke ka ịdị nta (OznỌd. 84:23–26). Ndị a ka a kpọrọ Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn na Iwu nke Moses. Mgbe Jisus biara n’ụwa, o weghachiri Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek nye ndị Juu na malite iwulite Nzukọ-nsọ n’etiti ha. Otu o sila dị, Ọkwa Nchụ-aja ahụ na Nzukọ-nsọ fukwara ọzọ site na ngọnarị okwukwe. E weghachiri ha azụ n’ikpe-azụ site n’aka Joseph Smith nta (OznỌd. 27:12–13; 128:20; A—JS 1:73).

N’ime Ọkwa nchụ-aja Melkizedek e nwere ọkwa nile nke onye okenye, onye isi nchụ-aja, onye isi ezi na ụlọ, Iri asaa, na Ndi-ozi (OznỌd. 107). Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek ahụ ga-abụ otu mpaghara nke ala-eze elu-igwe oge nile n’elu ụwa.

Onye-isi nduzi nke Nzukọ Nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a bụ onye-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja dị elu ma-ọbụ nke Melkizedek, na o na-ejide ọtụghe ụzọ nile nke gbasara ala-eze Chineke n’elu ụwa. Ọkpụkpọ-oku nke Onye-isi nduzi ka nanị otu nwoke na-ejide n’otu oge, na ọ bụ ya bụ onye nanị ya n’elu ụwa e nyere ikike ilekọta ọtụghe ụzọ nile nke ọkwa nchu-aja (OznỌd. 107:64–67; OznỌd. 132:7).

Bipụta