Ikpe ọmụma nke mụọ Hụ kwa Chegharịa, Nchegharị Ọnọdụ nke na e mejọwo, ma-ọbụ mmetụta nke inwe mwute na iru-uju nke kwesịrị ya na mmehie ịyịkọ. O mehiewo ma ikpe mara ya, Lev. 6:1–6. Onye ọbụla nke ga-eketa oke nke oriri-nsọ na-ezughị oke, ikpe arụ na ọbara nke Jisus mara ya, 1 Ndị-Kọ 11:27. Ndị ikpe mara na-ewere ezi-okwu ahụ ka ihe siri ike, 1 Nif. 16:2. Anyị ga-enwe mmata-ihe zuru oke maka ikpe-ọmụma nke anyị, 2 Nif. 9:14. Ikpe-ọmụma m nke mụọ ka a zafuworo, Inọs 1:6. E nwere ntaram ahụhụ a nyapadoro, nke wetara mwute na nchegharị nke mụọ, Alma 42:18. Ka mmehie gị nile na-esogbu gị, jiri nsogbu ahụ nke ga-ewedata gị ruo na nchegharị, Alma 42:29. Ụfọdụ n’ime unu bụ ndị ikpe mara n’iru m kama aga m eme ebere, OznỌd. 38:14. Ọkpara Chineke achụwọ aja mgbaghara mmehie n’ihi omụma-ikpe nke ime mụọ nke ochie, Moses 6:54.