I were ya n’ụdị ya, Jisus Kraịst na ozi-ọma ya, nke bụ ntọ-ala siri ike na nkwado (OznỌd. 11:24 ; 33:12–13 ). Oke-nkume nwekwara ike ịtụnyere mkpughe, nke Chineke na-esi na ya mee ka mmadụ mara maka ozi-ọma ya (Mat. 16:15–18 ).
Oke-nkume ahụ ka ọ bụ, ihe zuru oke ka ọrụ ya bụ, Deut. 32:4 .
Onye-nwe bụ oke nkume m, n’ime ya ka m tụkwasịrị obi, 2 Sam. 22:2–3 .
A wapụtara otu nkume nke na-ejighị aka waa, Dan. 2:34–35 .
Onye ọbụla nke e wuliteworo n’elu oke nkume ahụ na-anata ezi-okwu, 2 Nif. 28:28 .
Ndị Juu ga-ajụ nkume ahụ (Kraịst) nke ha ga-ewukwasị n’ele ya, Jekọb 4:15–17 .
Ọ bụ n’elu oke-nkume nke Onye-mgbapụta anyị ka anyị ga-ewurịrị ntọ-ala anyị, Hil. 5:12 .
Onye ọbụla wukwasịrị ụlọ n’elu ozizi nile nke Kraịst na-ewukwasị n’elu oke-nkume ya, ma ọ gaghị ada mgbe ide mmiri nile bịara, 3 Nif. 11:39–40 (Mat. 7:24–27 ; 3 Nif. 18:12–13 ).
Onye amamihe na-ewu ụlọ ya n’elu nkume, 3 Nif. 14:24 .
Ọ bụrụ na-ewuru unu n’elu oke-nkume m, ụwa na ala-mụọ ha agaghị emeri unu, OznỌd. 6:34 .
Onye wuru ụlọ n’elu oke-nkume nke a a pụghị ịda, OznỌd. 50:44 .