Nrigo n’elu
Nhapụ dị n’usoro nke Onye-nzọpụta hapụrụ ụwa mgbe iri ụbọchị anọ gasịrị ka o bilitesiworo n’ọnwụ. Nrigo ahụ mere site n’otu ebe n’Ugwu Olive n’iru ndị na-eso ụzọ ya nile (Mak 16:19; Luk 24:51). N’oge ahụ ndị mụọ ozi abụọ si n’elu-igwe gbara-ama na mgbe dị n’iru Onye-nwe ga-alọta n’otu aka ahụ (Ọlndoz. 1:9–12).