Duhie, Nduhie, Nghọgbu Hụ kwa Aghụghọ; Ghaa-ụgha N’ime akwụkwọ-nsọ nile, iduhie bụ ime ka mmadụ kwere ihe na-abụghị ezi-okwu. Onye ahụ na-an̄ụghị kwa iyi aghụghọ ga-arigo n’ugwu nke Onye-nwe, Abụọma 24:4. Napụta m site n’aka onye nduhie, Abụọma 43:1. Ahụhụ ga-adiri ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ma ezi ihe ihe ọjọọ, Aịsa. 5:20 (2 Nif. 15:20). Ka onye ọbụla ghara idiehie onwe ya, 1 Ndị-Kọ 3:18. Unu ekwela ka onye ọbụla were okwu efu duhie unu, Ndị-Efe. 5:6. Ndị ajọọ mmadụ ga na-eduhie ma aga eduhiekwa ha, 2 Tim. 3:13. Setan onye duhiere ụwa nile, ka chụdara, Mkpu. 12:9. E kere Setan agbụ ka ọ ghara iduhie mba nile ọzọ, Mkpu. 20:1–3. E nweghị ike ighọgbu Onye-nwe, 2 Nif. 9:41. Ọbụrụ na unu ga-esoro Ọkpara ahụ, na-enweghị aghụghọ n’iru Chineke, unu ga-enweta Mụọ Nsọ, 2 Nif. 31:13. Sherọm kwupụtara na-eduhiere ya site n’ike nke ekwensu, Jekọb 7:18. A ghogburu ndị nke Noa site n’okwu otuto nile na-esighi n’obi, Mosa. 11:7. Ndị amamihe ewerewo Mụọ Nsọ dika onye ndụzi ha, ma eduhieghi kwa ha, OznỌd. 45:57. Ahụhụ ga-adịrị ha bụ ndị na-eduhie, OznỌd. 50:6. Ọ wee ghọọ Setan, nna nke okwu ụgha nile na-iduhie na ime ka ndị mmadụ kpuo isi, Moses 4:4.