Ihe isi-ike Hụ kwa Inye nsogbu, Mkpagbu; Nọgide; Nwaa, Ọnwụnwa; Taa-ahụhụ, N’ata ahụhụ Site n’ihe isi-ike, ọnwụnwa nile, mkpagbu nile, na nnukwu nsogbu—mmadụ nwere ike nweta ọtụtụ uche onwe nile ga-edu ya gaa na-ito-eto nke mụọ na iga-n’iru ebighi-ebi site na-ichigharịkwute Onye-nwe. Chineke n’onwe ya zọpụtaworo unu site n’ime ihe isi-ike unu nile na mkpagbu nile unu, 1 Sam. 10:19. Ha wee bekuo Onye-nwe akwa n’ime nsogbu ha, Abụọma 107:6, 13, 19, 28. Ọbụna na Onye-nwe ga-enye unu achịcha nke ihe isi-ike, ma Ọ gaghị ewezuga ndị-ozizi unu, Aịsa. 30:20–21. N’ihi na ọ dịrịrị mkpa na-aga-enwe mmegide n’ihe nile, 2 Nif. 2:11. Ọbụrụ na ha enweghị ihe ilu ha a gaghị enwe ihe ụtọ, OznỌd. 29:39. Ihe isi-ike gị ga-abụ mana oge nta, OznỌd. 121:7–8. Ihe ndị a nile ga-enye gị uche nke onwe, ma ga-abụ maka ọdị mma gị, OznỌd. 122:5–8. Ha na-edetụkwa ihe ilu ahụ ire, ka ha wee mara ikwe ọnụ-ahịa ezi-ihe, Moses 6:55.