Nineve Hụ kwa Asiria; Jona N’ime Testament Ochie, isi obodo Asiria na ihe karịrị narị afọ abụọ, ọ bụụrụ nnukwu etiti ebe ịzụ ahịa n’ọnụ-mmiri mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke osimiri Tigris. Ọ dara n’ọdịda nke mba ukwu Asiria, n’afọ 606 tutu a mụọ Kraịst. Senakerib, bụ eze Asiria, wee biri na Nineve, 2 Ndez. 19:36. Jona ka e zigara ịkpọ nnukwu obodo ahụ ka ha chegharịa, Jona 1:1–2 (Jona 3:1–4). Ndị Nineve wee chegharịa, Jona 3:5–10. Kraịst jiri Nineve mee ihe ịma-atụ nke nchegharị n’iru ndị Juu, Mat. 12:41.