Ghaa-ụgha Hụ kwa Duhie, Nduhie, Nghọgbu; Ikwu ihe ọjọọ; Ịkwụ-ọtọ, Kwụ-ọtọ Mgbasa-ozi ọbụla nke asị ma-ọbụ na-abụghị ezi-okwu n’ihi ebum n’obi nghọgbu. Unu ezula ori, unu aghọkwala aghụghọ, unu ekwula okwu-ụgha, Lev. 19:11. Unu ezula ori, unu . ma m wee kpọọ ya ihe-arụ, Abụọma 119:163. Ihe-arụ n’anya Onye- -ọnụ okwu-ụgha bụ, Ilu 12:22. Ndị m ka ha bụ bụ ndị na-adịghị ekwu okwu-ụgha, Aịsa. 63:8. Ekwensu bụ onye-ụgha na nna ụgha nile, Jọn 8:44 (2 Nif. 2:18; Ita 8:25; Moses 4:4). Ọ bụghị mmadụ ka ị gwara okwu-ụgha kama-ọbụ Chineke, Ọlndoz. 5:4 (Alma 12:3). Ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị, Ana m ahụ Chineke n’anya, ma na-akpọ nwanne ya nwoke asị̀, ọ bụ onye-ụgha, 1 Jọn 4:20. Ndị-ụgha nile ga-enwe oke n’ime ọnwụ nke ugboro abụọ ahụ, Mkpu. 21:8 (OznỌd. 63:17). Ahụhụ na-adịrị onye okwu-ụgha, n’ihi na a ga-atụba ya n’ala mụọ, 2 Nif. 9:34. Ọtụtụ ndị ga-akụzi ozizi ụgha, na-asị, kwuo ntakịrị okwu ụgha ma ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ime nke a, 2 Nif. 28:8–9 (OznỌd. 10:25). Unu na-atụgharị uche nye onwe unu na unu nwere ike ịgwa Onye-nwe okwu-ụgha? Alma 5:17. Ị bụ Chineke nke ezi-okwu ma 1 nweghị ike ikwu okwu-ụgha, Ita 3:12 (Ọnọgụ. 23:19; 1 Sam. 15:29; Taịtọs 1:2; Ndị-Hib. 6:18; Inọs 1:6). Onye nke kwuru okwu-ụgha ma na-agaghị echegharị ka a ga-achụpụ, OznỌd. 42:21. Ndị ụgha nile ga-eketa ebube nke telestial, OznỌd. 76:81, 103–106. Anyị kwere na-ikwụwa aka-ọtọ, Ndep. Ok 1:13.