Amiulek Hụ kwa Alma, Nwa-nwoke nke Alma N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, onye mgbasa ozi-ọma ya na Alma so, nwa-nwoke nke Alma. Otu Mụọ-ozi letara ya, Alma 8:20; 10:7. Nabatara Alma n’ime ụlọ ya, Alma 8:21–27. O kwusara ozi-ọma n’ike nye ndị Amọnaiha, Alma 8:29–32; 10:1–11. O si n’agbụrụ Nifaị, Lihaị, na Manase, Alma 10:2–3. Gbara-ama banyere Ezi-okwu, Alma 10:4–11. Kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa na nchegharị, ma a jụrụ ya ajụ, Alma 10:12–32. Ya na Ziezrọm nwere ndọrọ ndọrọ, Alma 11:20–40. Wee kuzie banyere mbilite n’ọnwụ, ikpe na mweghachi, Alma 11:41–45. Chọrọ ka-akwụsị igbu ndị kwere na Jisus Kraịst, Alma 14:9–10. A tụrụ ya na Alma mkpọrọ, Alma 14:14–23. Dọbiri ụdọ nile nke mkpọrọ e jiri kee ha site n’okwukwe, Alma 14:24–29. Gbara-ama banyere aja mgbaghara mmehie, ebere, na ikpe ziri ezi, Alma 34:8–16. Kuziri banyere ekpere, Alma 34:17–28. Ọ gbara ndị mmadụ ume ka ha ghara igbu oge maka ụbọchị nchegharị, Alma 34:30–41. Okwukwe nke Alma na Amiulek bụ ihe mere ụlọ mkpọrọ ahụ ji tụgharịa daa n’ala, Ita 12:13.