Ido-nsọ Hụ kwa Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie; Jisus Kraịst; Mee ka ozi-ezi, Nkwado ziri-ezi Usoro nke inwerewa onwe site na mmehie; enweghị ntụpọ, ịdị ọcha na ịdị nsọ site na aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst (Moses 6:59–60). Chineke ahọpụtawo unu nye nzọpụta site n’ido nsọ nke mụọ ahụ, 2 Ndị-Tes. 2:13. E dowo anyị nsọ site na-inye onyinye nke arụ Jisus, Ndị-Hib. 10:10. Jisus tara ahụhụ ka ọ wee doo ndị mmadụ nsọ jiri ọbara ya, Ndị-Hib. 13:12. Ndị-isi nchụ-aja ka e doro nsọ ma uwe ha nile ka a sapụrụ ọcha site n’ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ, Alma 13:10–12. Ido-nsọ na-abịara ndị ahụ bụ ndị kwenyere obi ha nile nye Chineke, Hil. 3:33–35. Chegharịa ka e wee doo unu nsọ site na nnabata nke Mụọ Nsọ, 3 Nif. 27:20. Ido-nsọ site n’amara nke Jisus Kraịst bụ ihe ziri ezi na ezi-okwu, OznỌd. 20:31. Jisus bịara ido ụwa nsọ, OznỌd. 76:41. Doo nụ onwe unu nsọ ka echiche nile unu na-abụzị nanị nye Chineke, OznỌd. 88:68.