Ngọnarị okwukwe Hụ kwa Mweghachi nke ozi-ọma; Nnupụ-isi Ichigharị pụọ site n’ezi-okwu nke ndị mmadụ n’onwe ha, Nzukọ-nsọ, ma-ọbụ mba nile. Ngọnarị nke okwukwe ọha Israel chegidere obi ha nile site na-ichigharị pụọ n’ebe Onye-nwe nọ, Deut. 29:18. Ebe ọ̀hụ́ na-adịghị, ndị mmadụ na-ala n’iyi, Ilu 29:18. Ha emebiwo ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide, Aịsa. 24:5. Ifufe wee tikwasi ụlọ ahụ ma o wee daa, Mat. 7:27. Ọ na eju m anya na a na-ewepụ unu ọsọ-ọsọ baa n’ozi-ọma ọzọ, Ndị-Gal. 1:6. Ha malitere n’ụzọ ahụ dị mma mana ha furu ụzọ n’igirigi ahụ, 1 Nif. 8:23 (1 Nif. 12:17). Mgbe ha rachaworo mkpụrụ osisi ahụ, ha wee daba n’ụzọ a sị esola, 1 Nif. 8:28. Ngọnarị okwukwe nke ndị Nifaị bụ nnukwu okwute mkpobi-ụkwụ nye ndị na-ekweghị ekwe, Alma 4:6–12. Ọtụtụ ndị Nzukọ-nsọ malitere ịbụ ndị mpako ruo na-isogbu ibe ha, Hil. 3:33–34 (Hil. 4:11–13; 5:2–3). Mgbe onye-nwe na-amụba ndị ya, mgbe ụfọdụ ha na-emesi obi ha ike ma chefuo ya, Hil. 12:2; 13:38. Ndị Nifaị mesiri obi ha ike ma daba n’okpuru ike Setan, 3 Nif. 2:1–3. Moronaị buru amụma banyere ngọnarị-okwukwe n’ụbọchị ndị ikpe-azụ, Mọm. 8:28, 31–41. Ngọnarị okwukwe ga-ebu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ụzọ, OznỌd. 1:13–16. Ngọnarị okwukwe nke nzukọ ndị mbụ na-eso ụzọ Kraịst Ndị mmadụ a na-abịa m nso jiri egbugbere ọnụ ha, Aịsa. 29:10, 13. Ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa, Aịsa. 60:2. Onye-nwe ga-ezita ụnwụ nke ịnụ okwu nile nke Onye-nwe, Emọs 8:11. Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha ga-ebili, Mat. 24:24. Agụ jọgburu onwe ya ga-abịa n’etiti unu, Ọlndoz. 20:29. Ọ na-eju m anya na a na-ewepụ unu ọsọ ọsọ, Ndị-Gal. 1:6. Ngọnarị okwukwe ga-ebu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ uzọ, 2 Ndị-Tes. 2:3. Ndị ufọdụ na-ehie ụzọ banyere ezi-okwu ahụ, 2 Tim. 2:18. Ndị ụfọdụ nwere ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke mana ha na-agọnarị ike ya, 2 Tim. 3:5. Oge ahụ na-abịa mgbe ha na-agaghị anagide ozizi dị mma, 2 Tim. 4:3–4. A ga-enwe ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha n’etiti ndị mmadụ, 2 Pita 2:1. Ndị mmadụ ụfọdụ gbebara na-agọnarị Onye-nwe Chineke, Jud 1:4. Ụfọdụ mmadụ sịrị na ha bụ ndị-ozi ma ha abụghị, Mkpu. 2:2. Nifaị wee hụ nhiwe nnukwu nzukọ ahụ rụrụ arụ, 1 Nif. 13:26. Ndị Jentaịlụ azọhiewo ụkwụ ma ha ewulitewo ọtụtụ nzukọ, 2 Nif. 26:20. Ha akpafuwo site n’emume nsọ m nile, ma ha emebiwo ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide m, OznỌd. 1:15. Ọchịchịrị e kpuchiwo ụwa, ma ọchịchịrị karịrị akarị kpuchiri obi nile nke ndị mmadụ, OznỌd. 112:23. Joseph ka a gwara na nzukọ nile ezighị-ezi; obi ha nile dị anya n’ebe Chineke nọ, A—JS 1:19.