Ebube Hụ kwa Ezi-okwu; Ìhè, Ìhè nke Kraịst; Ogo nile nke ebube N’ime akwụkwọ-nsọ nile ọtụtụ mgbe otuto na-atụnyere ìhè na ezi-okwu nke Chineke. O nwekwara ike tụnyere ịja mma, ma-ọbụ inye nnukwu ugwu na otu ụdị ọnọdụ nke ndụ ebighi-ebi ma-ọbụ nye ebube nke Chineke. Nsọ ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha dị, elu ụwa nile jupụtara n’ebube ya, Aịsa. 6:3 (2 Nif. 16:3). A na-enwogha anyị baa n’ime otu onyinyo ahụ site n’ebube ruọ n’ebube, 2 Ndị-Kọ 3:18. Ọ ga-ebuli m elu, ibinyere ya n’ebube, Alma 36:28. Otuto nile a natara na mbilite n’onwu ga-adi iche iche dịka ezi-omume siri dị, OznỌd. 76:50–119. Ebube nke Chineke bụ akọ na uche, OznỌd. 93:36. Ebube nke Chineke bụ iweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ, Moses 1:39. Mwee hụ Mmadụ abụọ, ndị mmụke ha na ebube ha karịrị nkọwa nile, A—JS 1:17.