Otu ọgbakọ ndị mmadụ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ ụmụ nke onye-amụma Nifaị, nwa-nwoke nke Lihaị. Ha kewapụrụ onwe ha site na ndị Leman ma ha bụụrụ ndị ezị-omume n’ozuzu karịa ndị Leman. Otu-o-sila dị e mesịrị bibie ha site n’aka ndị Leman n’ihi ajọọ-omume.
Ndị Nifaị kewapụrụ site na ndị Leman, 2 Nif. 5:5–17 .
Ndị mmadụ ahụ na-abụghị ndị Leman bụ ndị Nifaị, Jekọb 1:13 .
A kpalitere mụọ ndị Nifaị site na mkpebi ka mma, Alma 43:6–9, 45 .
Ọdịghị mgbe ndị Nifaị nweworo an̄ụrị karịa n’oge nke Moronaị, Alma 50:23 .
A zọpụtara ndị Nifaị n’ihi ekpere nile nke ndị ezi-omume, Alma 62:40 .
Ndị Nifaị malitere ila-azụ n’ekweghị-ekwe, Hil. 6:34–35 .
Jisus kụziri ihe ma kwusaa ozi-ọma n’etiti ndị Nifaị, 3 Nif. 11:1–28:12 .
A gbanwere mmadụ nile nye Onye-nwe ma ha nwekọtara ihe nile ọnụ, 4 Nif. 1:2–3 .
E nweghị ndọrọ ndọrọ, ịhụ n’anya nke Chineke bi n’ime obi ha nile, ma ha bụụrụ ndị kachasị inwe an̄ụrị n’etiti ndị mmadụ, 4 Nif. 1:15–16 .
Ndị Nifaị malitere inwe mpako na ịbụ ihe efu, 4 Nif. 1:43 .
Ọbara na nnukwu igbu mmadụ gbasara gazuo iru nke ala ahụ nile, Mọm. 2:8 .
Ndị Nifaị mụbara n’ajọọ omume ma Mọmọn jụrụ ịbụ onye ndu ha, Mọm. 3:9–11 .
Ndị Nifaị nile, ewezuga iri-abụọ-na anọ, ka e gburu, Mọm. 6:7–15 .
Ndị Nifaị ahụ na-agaghị agọnarị Kraịst ka e gburu, Moro. 1:2 .
Ndị Nifaị ka e bibiri n’ihi ajọọ-omume na mmehie ha nile, OznỌd. 3:18 .
Kpachapụ anya maka mpako ka unu ghara ịbụ dịka ndị Nifaị, OznỌd. 38:39 .