Nwaa, Ọnwụnwa Hụ kwa Ekwensu; Nọgide; Ohere-ịhọrọ Nnwale nke mmadụ inwe ike ịhọrọ ihe ọma karịa ihe ọjọọ; Itụ-akpịrị ka e mehie ma soro Setan karịa isoro Chineke. E dubakwala anyị n’ime ọnwụnwa, kama napụta anyị site n’ihe ọjọọ, Mat. 6:13 (3 Nif. 13:12). Chineke agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide, 1 Ndị-Kọ 10:13. A nwanworo Kraịst n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, Ndị-Hib. 4:14–15. Ngọzi na-adịrị nwoke ahụ onye na-atachi obi n’ọnwụnwa, Jemes 1:12–14. Ọnwụnwa nile nke onye-iro a gaghị enwe ike karịa n’arụ ndị ahụ na-an̄a ntị n’okwu nke Chineke, 1 Nif. 15:24 (Hil. 5:12). Mmadụ enweghị ike iji aka ya mee ihe ọ chọrọ ma ọbụghị ma otu ihe tụrụ ya akpịrị ma-ọbụ nke ọzọ, 2 Nif. 2:11–16. Chee nche ma kpee ekpere esepụghị-aka ka a ghara ịnwa unu ọnwụnwa karịa nke unu ga-ebuli, Alma 13:28. Kụziere ha iguzogide ọnwụnwa nile nke ekwensu, site n’okwukwe ha n’Onye-nwe Jisus Kraịst, Alma 37:33. Na-ekpe ekpere oge nile, eleghị anya unu abaa n’ime ọnwụnwa, 3 Nif. 18:15, 18 (OznỌd. 20:33; 31:12; 61:39). Kpachara anya maka mpako maka ka ị ghara ịdaba n’ime ọnwụnwa, OznỌd. 23:1. Adam bịara n’okpuru uche nke ekwensu, n’ihi na o kwenyeere ọnwụnwa, OznỌd. 29:39–40. M wee bụrụ onye a hapụrụ nye ụdị ọnwụnwa nile dị iche iche, A—JS 1:28.