Inwe okwukwe na mmadụ ma-ọbụ inabata na ihe bụ ezi-okwu. Mmadụ ga-echegharị na kwere na Jisus Kraịst ka e wee zọpụta ya n’ime ala-eze Chineke (OznỌd. 20:29 ).
Kwerenu na Onye-nwe Chineke unu; Kwere nụ na ndị amụma ya, 2 Ihem. 20:20 .
Ọ dịghị imerụ arụ Daniel merụrụ n’ọlụlụ ọdụm n’ihi na o kwere na Chineke, Dan. 6:23 .
Dịka 1 kwere ka e meere gị, Mat. 8:13 .
Ka ha ra bụ ihe nile unu ga-arịọ n’ekpere, na ekwere, unu ga-anata, Mat. 21:22 .
Atụla egwu, nanị kwere, Mak 5:36 .
Onye nke kwere, pụrụ ime ihe nile, Mak 9:23–24 .
Onye nke kwere, nke mekwara baptism, a ga-azọpụta ya, Mak 16:16 (2 Nif. 2:9 ; 3 Nif. 11:33–35 ).
Onye nke kwere n’Ọkpara ahụ ga-enwe ndụ mgbe nile na-adigide, Jọn 3:16, 18, 36 (Jọn 5:24 ; OznỌd. 10:50 ).
Anyị ekwewo marakwa na gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Jọn 6:69 .
Onye na-ekwere na mụ ọbụladị ma-asi na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ, Jọn 11:25–26 .
Anyị bụ ndị kwere-ekwe, na-aba n’izuike, Ndị-Hib. 4:3 .
Kwere na Jisus Kraịst ma hụrịta nụ onwe unu n’anya, 1 Jọn 3:23 .
Ọ dịghị onye ọbụla Mesaịa ga-ebibi nke kwere na ya, 2 Nif. 6:14 .
A ga-eti ndị Juu ihe otiti ruo mgbe a ga-eme ka ha kwere na Kraịst, 2 Nif. 25:16 .
Ọbụrụ na un̄u kwere ihe nile ndia, hụ nụ na unu na-eme ha, Mosa. 4:10 .
Ọkpara ahụ ga-ebukwasi onwe ya njehie nile nke ndị kwere n’aha ya, Alma 11:40 .
Ngọzi na-adịrị onye ahụ kwere n’okwu nke Chineke na-amanyeghị ya amanye, Alma 32:16 .
Ọbụrụ na unu enweghi ike ime ihe na-akarịghi ichọ ikwere, ka ọchichọ nke a ruọ ọrụ n’ime unu, Alma 32:27 .
Ọbụrụ na unu kwere n’aha Kraịst, unu ga-echegharị, Hil. 14:13 .
Onye ọbụla kwere na Kraịst, kweekwara na Nna ahụ, 3 Nif. 11:35 .
Ọdibeghị mgbe mmadụ kwere n’Onye-nwe dịka nwa nne-nwoke Jared, Ita 3:15 .
Ihe ọbụla na-akpọ oku ime ka mmadụ kwere na Kraịst, e zitere ya site n’ike Kraịst, Moro. 7:16–17 .