Inye nkọwasị, Nkọwasị, Nwe nkọwasị Hụ kwa Ohere-ịhọrọ Onye-nwe ekwuwo na-ọbụ ihe dịịrị ndị mmadụ bụ ebum n’obi ha nile, agwa nile, mmasị ha nile na omume ha nile. Afọ nke nkọwasị: bụ afọ nke a na-atụ uche na ọ bụ ihe dịịrị ụmụ aka bụ omume ha nile, na ha nwekwara ike ime mmehie na ichegharị. Aga m ekpe onye ọbụla ikpe dịka ụzọ ya nile siri dị, Ezik. 18:30. Ha ga-enye nkọwasị banyere okwu ọbụla na-abaghị n’ihe, Mat. 12:36. Nye nkọwasi banyere ọrụ gị, Luk 16:2. Onye ọbụla n’ime anyị ga-enye nkọwasi banyere onwe ya nye Chineke, Ndị-Rom 14:12. Aga ekpe ndị nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, Mkpu. 20:12. Okwu anyị nile, ọrụ nile, na echiche nile ga-ama anyị ikpe, Alma 12:14. Anyị bụ ndị ikpe nke onwe anyị ma anyị ga-eme ihe ọma ma-ọbụ ihe ọjọọ, Alma 41:7. Unu nwere ohere imere onwe unu otu unu chọrọ, Hil. 14:29–31. Ihe nke a ka unu ga-akuzi—nchegharị na ime baptism nye ndị ahụ kwesịrị inye nkọwasi, Moro. 8:10. Mmadụ nile ga-echegharị ma mee baptism bụ ndị na-erutawo afọ nile nke nkọwasị, OznỌd. 18:42. Setan enweghị ike ịnwa ụmụ-ntakịrị ọnwụnwa ruo mgbe ha ga-amalite ịbịa nwewa nkọwasi n’iru m, OznỌd. 29:46–47. Ụmụ-aka ka a ga-eme baptism mgbe ha nọrọ afọ asatọ, OznỌd. 68:27. Onye ọbụla ga-enwe nkọwasi maka mmehie ya nile n’ụbọchị nke ikpe, OznỌd. 101:78. E nyewo ndị mmadụ i mara ezi-ihe site n’ihe ọjọọ; ya mere ha bụ ndị na-anọchi anya nye onwe ha, Moses 6:56. Ndị mmadụ ka a ga-ata ahụhụ n’ihi mmehie nke aka ha, Ndep. Ok 1:2.