Mejọọ I mebi iwu dị nsọ, i me mmehie ma-ọbụ ịkpata ọnọdụ na-adịghị mma ma-ọbụ mmeru-arụ; nakwa imejọ ma-ọbụ ime iwe. Nwanne e mejọworo dị ike inwere karịa obodo siri ike, Ilu 18:19. Ọbụrụ n’anya aka-nri gị e mejọọ gị, ghụpụ ya, Mat. 5:29. Onye ọbụla nke ga-emejọ otu n’ime ndị nta ndịa ndị kwere na Mụ, ọ gaara aka mma na o mikpuru n’ogbu nke oke osimiri, Mat. 18:6 (OznỌd. 121:19–22). Ọbụrụ na nwanne unu nwoke ma-ọbụ nwanne nwanyị emejọọ unu, ma kwupụta ya, unu ga-eme udo, OznỌd. 42:88. O nweghị ihe mmadụ ji emehie Chineke, ma-ọbụghị ndị ahụ ndị na-anaghi ekwupụta ọrụ aka ya ma ha anaghị erube isi nye iwu-nsọ ya nile, OznỌd. 59:21.