Ndịnyom, Nwanyị Hụ kwa Nwoke, ndị nwoke Otu onye nne, nwa nwanyị nke Chineke. Okwu ahụ nwanyị ka a na-eji oge ụfọdụ n’ime akwụkwọ-nsọ dịka akara nke nkwanye ugwu (Jọn 19:26; Alma 19:10). Chineke kere nwoke na nwanyị, Jen. 1:27 (Moses 2:27; 6:9; Abr. 4:27). Nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma, ọnụ ahịa ya karịrị ruby nke ukwu, Ilu 31:10–31. Nwanyị bụ ebube nke nwoke, 1 Ndị-Kọ 11:7. Nwoke adịghị ma nwanyị a nọghị ya, nwanyị adịghị ma nwoke anọghị kwa ya n’ime Onye-nwe, 1 Ndị-Kọ 11:11. Ndịnyom were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, 1 Tim. 2:9–10. Mu, Onye-nwe Chineke na-enwe mmasị n’ịdị-ọcha mmekọrịta nke ndịnyom, Jekọb 2:28. A gbagharawo gị mmehie gị nile, ma ịbụ nwagbọghọ a họpụtara, OznỌd. 25. Ndịnyom nwere ihe ruru ha n’ebe di ha nọ, OznỌd. 83:2.