Ụzọ Hụ kwa Jee-ije, Soro Chineke jegharịa; Jisus Kraịst Uzọ ahụ ma-ọbụ usoro mmadụ na-eso. Jisus sịrị na ya bụ ụzọ ahụ (Jọn 14:4–6). Dobe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe ka i wee jee ije n’ụzọ ya nile, Deut. 8:6. Zụlite nwanta n’ụzọ o kwesịrị ịga, Ilu 22:6 (2 Nif. 4:5). Onye-nwe kwuru na ụzọ ya nile dị elu karịa ụzọ anyị nile, Aịsa. 55:8–9. Warawara ka ọnụ ụzọ ama ahụ dị, mkpafa ka ụzọ ahụ dịkwa nke na-eduba na ndụ, Mat. 7:13–14 (3 Nif. 14:13–14; 27:33; OznỌd. 132:22, 25). Chineke ga-emere unu ụzọ maka unu ịgbanarị ọnwụnwa, 1 Ndị-Kọ 10:13. Onye-nwe anaghị enye iwu-nsọ, ma ọbụghị na ọ ga-edozi ụzọ ụmụ ya ga-esi mezuo ha, 1 Nif. 3:7 (1 Nif. 9:6; 17:3, 13). Ọdịghị ụzọ ọzọ ma-ọbụghị site n’ọnụ-ụzọ-ama ahụ, 2 Nif. 9:41. Unu nwere onwe unu ime ihe unu chọrọ ime ịhọrọ ụzọ nke ọnwụ mgbe nile na-adịgide ma-ọbụ ụzọ nke ndụ ebighi-ebi, 2 Nif. 10:23. Nke a bụ ụzọ ahụ ọ dịghị kwa ụzọ ma-ọbụ aha ọzọ dị, 2 Nif. 31:21 (Mosa. 3:17; Alma 38:9; Hil. 5:9). N’onyinye nke Ọkpara ya ka Chineke kwadoworo ụzọ nke kachasị mma karịa, Ita 12:11 (1 Ndị-Kọ 12:31). Onye ọbụla na-aga n’ụzọ nke ya, OznỌd. 1:16. Ọ dị mkpa ka e mee ya n’ụzọ nke m, OznỌd. 104:16.