Onye-nsọ Hụ kwa Ndị-otu-Kraịst; Nzukọ nke Jisus Kraịst; Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a Onye òtù nke Nzukọ nke Jisus Kraịst kwesịrị ntụkwasị-obi. Chịkọtanụ Ndị-nsọ m ọnụ nye m, Abụọma 50:5. Sọl mere ihe ọjọọ dị ukwuu n’ebe Ndị-nsọ nọ na Jerusalem dị, Ọlndoz. 9:1–21. Pịta rịdakwuru kwa Ndị-nsọ ndị bi na Lida, Ọlndoz. 9:32. Amara na udo dịrị ndị nile nọ na Rom ndị a kpọrọ ịbụ Ndị-nsọ, Ndị-Rom 1:7. Unu soro Ndị-nsọ bụrụ ụmụ amala, Ndị-Efe. 2:19–21. Ahụrụ m Nzukọ-nsọ nke Nna-atụrụ ahụ, bụ Ndị-nsọ nke Chineke, 1 Nif. 14:12. Mmadụ nke ụdị okike bụ onye-iro Chineke, ma ọbụghị ma ọ ghọrọ Onye-nsọ site n’aja mgbaghara mmehie nke Kraịst, Mosa. 3:19. Mụ, Onye-nwe agọziworị ala maka iji rụọ ọrụ nke Ndị-nsọ m, OznỌd. 61:17. Setan na-ebu agha megide Ndị-nsọ nke Chineke, OznỌd. 76:28–29. Rụsie-ọrụ ike ijikere Ndị-nsọ maka ikpe ahụ nke gaje ị̀bịa, OznỌd. 88:84–85. Ndị-nsọ kwesịrị inyepụ ihe ha nwere nye ndị ogbenye na ndị nwere mkpagbu, OznỌd. 105:3. Ọkwa-ọrụ ndị a akpọrọ aha ka m nyeworo maka irụ-ọrụ nke ije-ozị na izu-oke nke ndị-nsọ m, OznỌd. 124:143 (Ndị-Efe. 4:12).