Onye e buru ụzọ mụọ
N’oge nke ndị isi ezi na ụlọ agba ochie, nwa nwoke e buru ụzọ mụọ natara ọnọdụ ọkpara (Jen. 43:33) na siri otu a keta oke nke onye ndu nke ezi na ụlọ mgbe nna ya nwụsịrị. Onye e buru uzọ mụọ ga-abụrụ onye tozuru oke iji nwee ike iwere ihe nke a dịịrị ya (1 Ihem. 5:1–2) na ọnọdụ ọkpara ya nwere ike ifu narị ya site na-emeghị ezi-omume.
N’okpuru iwu Moses, nwa nwoke e buru ụzọ mụọ ka e lere anya dịka nke Chineke. Onye e buru ụzọ mụ na-anata oke abụọ nke ihe nile nna ya nwere (Deut. 21:17). Mgbe nna ya nwụsịrị ọnwụ, ọ dịịrị ya ilekọta nne ya na ụmụnne ya ndịnyom.
Oke nke anụmanụ nile eburu ụzọ mụọ bụ nke Chineke. Anụmanụ nile dị ọcha ka e eji achụ-aja nile, ebe anụmanụ ndị na-adịghị-ọcha ka a gbapụtara ma-ọbụ ree ma-ọbụ e gbuo (Ọpụ. 13:2, 11–13; 34:19–20; Lev. 27:11–13, 26–27).
Onye e buru ụzọ mụọ bụ akara nọchitere anya Jisus Kraịst na ije-ozị ya n’ụwa, ichetara ndị mmadụ na nnukwu Mesaịa ahụ ga-abịa (Moses 5:4–8; 6:63).
Jisus bụụrụ onye e buru ụzọ mụọ n’ime ụmụ nke Nna anyị nke Elu-igwe na mụọ, Onye Nna mụrụ nanị ya n’anụ arụ, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ ọnwụ bilie n’ime mbilite n’ọnwụ (Ndị-Kọl. 1:13–18). Ndị-nsọ nile kwesịrị ntụkwasị-obi na, na-aghọ ndị otu Nzukọ-nsọ nke Onye e Buru Ụzọ mụọ n’ime ebighi-ebi (OznỌd. 93:21–22).