Nghọta Hụ kwa Amamihe; Ezi-okwu; Mmata-ihe I nweta uru mmata ihe nke ma-ọbụ mara mpụtara nke ụfọdụ ezi-okwu, gụnye-kwa ntinye ya na ndụ. A daberekwala na nghọta onwe gị, Ilu 3:5. Were ihe nile i nwetaworo nweta amamihe, Ilu 4:7. Jisus gwara ha okwu n’ilu nile ma ụfọdụ a dịghị aghọta, Mat. 13:12–17. Onye-nwe meghere nghọta ha, Luk 24:45. Ọ bụrụ na unu enweghị ike ịghọta okwu ndị a, ọ ga-abụ n’ihi na unu ajụghị, 2 Nif. 32:4 (3 Nif. 17:3). Akụkọ ndekọta nile ahụ ka e chekwara ka anyị wee nwee ike gụọ ma ghọta, Mosa. 1:2–5. N’ihi ekweghị-ekwe ha, ha enweghị ike ịghọta okwu nke Chineke, Mosa. 26:3. Ha bụụrụ ndị nwoke nwere nghọta siri ike, Alma 17:2–3. Okwu ahụ a malitewo ime ka nghọta m nwee mgba-ama, Alma 32:28. Ka anyị tụgharịkọta uche ka unu nwee nghọta, OznỌd. 50:10–12, 19–23. Nne na nna ga-akụzirịrị ụmụ ha ịghọta, OznỌd. 68:25. Ọrụ nile na ihe omimi nile nke Chineke ka e nwere ike ịghọta site nanị na Mụọ Nsọ, OznỌd. 76:114–116. Setan na-achọ ịtụgharị obi nile nke ndị mmadụ site na nghọta, OznỌd. 78:10. Ìhè nke Kraịst ahụ na-akpọlite nghọta anyị nile, OznỌd. 88:11.