Ụkpụrụ Hụ kwa Ozi-ọma Otu ntọ-ala ozizi, ezi-okwu ma-ọbụ iwu. Ụkpụrụ mbụ nile nke ozi-ọma bụ okwukwe n’ime Onye-nwe Jisus Kraịst na nchegharị (Ndep. Ok 1:4). Na-ahapụghị ụkpụrụ nile nke ozizi nke Kraịst, ka anyị gaa n’iru baa n’itozu oke, Ndị-Hib. 6:1–3. Ndị okenye, ndị nchụ-aja na ndị nkụzi ga-akụzi ụkpụrụ nile nke ozi-ọma m, nke dị n’ime akwụkwọ-nsọ nile, OznỌd. 42:12. Ka e wee kuziere unu n’ụzọ zuru oke karịa, n’ụkpụrụ, n’ozizi, n’ihe nile, OznỌd. 88:78 (OznỌd. 97:14). Ka onye ọbụla jee ije n’ozizi na ụkpụrụ metụtara ọdị n’iru dịka ohere-ịhọrọ n’etiti mma na njọ nke m nyeworo ya siri dị, OznỌd. 101:78. Ihe ọbụla bụ ụkpụrụ nke amamihe anyị toruru na ndụ nke a, ọ ga-anọrọ n’ime anyị na mbilite n’ọnwụ, OznỌd. 130:18–19.