Ebere, Obi-ebere Hụ kwa Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie; Amara; Gbaghara; Ikpe-ziri-ezi; Jisus Kraịst Mụọ nke ọmịko, ịdị nro, na mgbaghara. Ebere bụ otu n’ime ịdị ka Chineke. Jisus Kraịst na-enye anyị ebere site na-ichụ-aja mgbaghara mmehie nke ya. Onye-nwe nwere obi ebere ma na-eme amara, Ọpụ. 34:6 (Deut. 4:31). Ruo mgbe nile ka ebere ya dị, 1 Ihem. 16:34. Ịdị mma na ebere ga-agba-so m, Abụọma 23:6. Onye na-emere onye ogbenye ebere ga-enwe an̄ụrị, Ilu 14:21. Ebere atọwo m ụtọ, ọ bụghị ịchụ aja, Hosea 6:6. Ngọzi na-adịrị ndị na-eme ebere; n’ihi na ndị ahụ ka a ga-emere ebere, Mat. 5:7 (3 Nif. 12:7). Ahụhụ ga-adịrị ndị-iru-abụọ, ndị na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nile ma hapụ ihe ka ịdị arọ n’iwu, bụ ikpe, na ebere, na okwukwe, Mat. 23:23. Nweenụ obi ebere, dịka Nna-unu nwere obi ebere, Luk 6:36. O siteghị n’ọrụ dị iche iche a rụrụ n’ezi-omume nke anyị zọpụta anyị, kama dịka ebere Ya siri dị, Taịtọs 3:5. Obi ebere nke Onye-nwe nọ n’elu mmadụ nile, 1 Nif. 1:20. Obi ebere enweghi ike ịzọpụta onye ahụ nke na-echegharịghị, Mosa. 2:38–39. Chineke na-emere ndị nile kwere na aha ya ebere, Alma 32:22. Ebere nwere ike metazuo ihe nile kwesịrị-ime nke ikpe zịrị-ezi chọrọ, Alma 34:16. I chere na ebere nwere ike izu ikpe ziri-ezi orị? Alma 42:25 (Alma 42:13–25). Ụmụ-ntakịrị dị ndụ n’ime Kraịst n’ihi ebere ya, Moro. 8:19–20 (OznỌd. 29:46). Aka ebere nke Jisus Kraịst achụwo aja mgbaghara mmehie n’ihi mmehie unu nile, OznỌd. 29:1. Site na ima-mma nke ọbara m nke m kwafuworo, ka m jiworo rịọ arịrịọ n’iru Nna maka ndị ahụ kweere na aha m, OznỌd. 38:4. Ndị ahụ debere ọgbụgba-ndụ ahụ ka a ga-emere ebere, OznỌd. 54:6. Mụ Onye-nwe na-agbaghara mmehie nile, ma adị m obi ebere nye ndị nke kwupụtara mmehie ha nile jiri obi nile dị umeala, OznỌd. 61:2. Mụ Onye-nwe na-egosi ebere nye ndị nile dị nwayọ n’obi, OznỌd. 97:2. Onye nabatara gị dịka nwatakịrị nabatara ala-eze nke m, n’ihi na ha ka a ga-emere ebere, OznỌd. 99:3. Ebere ga-agapụ n’iru nke gị, Moses 7:31.