Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọnwụ nke mụọ


Ọnwụ nke mụọ

Nkewapụ site na Chineke na ike ya nile nke na-esi n’ime ya; Inwụ anwụ n’ihe metụtara ezi-omume. Lusifa na otu mpaghara n’ime mpaghara atọ usuu ndị agha nile nke elu-igwe hụrụ ahụhụ nke ọnwụ nke mụọ mgbe a chụpụrụ ha site n’elu-igwe (OznỌd. 29:36–37).

Ọnwụ nke mụọ ka ọdịda nke Adam webatara n’ime ụwa (Moses 6:48). Arụ nile na-anwụ anwụ nwere echiche ihe ọjọọ nile, okwu nile na ọrụ nile anwụwo ọnwụ nke mụọ mgbe ha ka dị ndụ n’elu ụwa (1 Tim. 5:6). Site n’aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst na site na nrube-isi nye ụkpụrụ nile na emume nsọ nile nke ozi-ọma, ndị nwoke na ndị nwanyị nwere ike ịbịa dị ọcha site na mmehie na merie ọnwụ nke mụọ.

Ọnwụ nke mụọ na-adịkwa gbasoro ọnwụ nke arụ na-anwụ anwụ. Na ndị ahụ biliworo n’ọnwụ na ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ka a ga-ekpe ikpe. Ndị ahụ ndị kpachapụrụ anya nupu-isi megide ìhè na ezi-okwu nke ozi-ọma ga-ahụ ahụhụ nke ọnwụ nke mụọ. Ọnwụ nke a ka a na-akpọkarị ọnwụ nke ugboro abụọ (Alma 12:16; Hil. 14:16–19; OznỌd. 76:36–38).

Bipụta