Ntụgwa nzuzo nile Hụ kwa Ken; Ndị-ori Gadiantọn Otu ọgbakọ ndị mmadụ e kekọtara ọnụ site na ịn̄ụ-iyi nile ibupụta ajọọ nzube nile nke ndị ọgbakọ ahụ. Nna nke okwu ụgha nile na-akpasu ụmụ nke mmadụ baa n’ime ntụgwa nzuzo nile, 2 Nif. 9:9. Ọ dịrịrị mkpa na m ga-ebibi ọrụ nzuzo nile nke ọchịchịrị, 2 Nif. 10:15. Ikpe nile nke Chineke bịakwasịrị ndị ọrụ nke ntụgwa nzuzo nile, Alma 37:30. Gadiantọn gosipụtara ọ fọdụrụ ntakịrị ịbụ mbibi nke ndị Nifaị nile, Hil. 2:4–13. Setan tinyere ya n’ime obi nile nke ndị mmadụ ahụ ka ha baa n’ịn̄ụ-iyi nzuzo nile na ọgbụgba-ndụ nile, Hil. 6:21–31. Onye-nwe adịghị arụ-ọrụ n’ime ntụgwa nzuzo nile, Ita 8:19. Mba nile ọbụla nke na-akwado ntụgwa nzuzo nile, a ga-ebibi ha, Ita 8:22–23. Ha jụrụ okwu nile nke ndị amụma, n’ihi otu nzuzo ha, Ita 11:22. Site n’ụbọchị nile nke Ken e nwere ntụgwa nzuzo, Moses 5:51.