Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Akụkọ agbụrụ


Akụkọ agbụrụ

Akuko ndekọta na-achuso ahịrị nke ụsoro ọmụmụ n’ezi na ụlọ. Ebe ọkwa-ọrụ nke Ọkwa Nchụ-aja ma-ọbụ ngọzi nile ụfọdụ bụ nke a hapụrụ nye otu ezi na ụlọ, akụkọ agbụrụ nile dịịrị oke mkpa (Jen. 5; 10; 25; 46; 1 Ihem. 1–9; Ezra 2:61–62; Neh. 7:63–64; Mat. 1:1–17; Luk 3:23–38; 1 Nif. 3:1–4; 5:14–19; Jarọm 1:1–2). N’ime Nzukọ-nsọ nke e weghachiri azụ taa, ndị otu Nzukọ-nsọ na-aga n’iru na-achọso ahịrị ezi na ụlọ nile nke usoro ọmụmụ ha, na mpaghara iji mata n’ezie ndị nna ochie ha nwụrụ anwụ ka ha nwee ike meere ha emume-nsọ nile nke nzọpụta na ọnọdụ ndị nna ochie ha. Emume-nsọ ndị a dị ire nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị nabatara ozi-ọma nke Jisus Kraịst n’ime ala mụọ (OznỌd. 127, 128).