Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Harris, Martin


Harris, Martin

Otu n’ime ndị aka-ebe atọ nke ịdị nsọ na ịbụ ezi-okwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn. O nyeere Joseph Smith na Nzukọ-nsọ enyem-aka ego. Onye-nwe gwara Martin Harris ka o ree arịa ya na nye ego ya iji kwụọ ụgwọ maka mbipụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn (OznỌd. 19:26–27, 34–35); ka ọbụrụ otu ima-atụ nye Nzukọ-nsọ (OznỌd. 58:35), na ka o nye aka kwụọ ụgwọ nile nke igbasa ozi-ọma (OznỌd. 104:26).

A chụpụrụ Martin Harris site na-ibu onye otu Nzukọ-nsọ mana n’ikpeazụ ọ lọghachiri n’uju ịbụ onye otu. Ruo n’ọgwụgwụ ndụ ya, ọ gbara-aka-ebe na ọ hụrụ mụọ-ozi Moronaị na epekele ọla-edo nile nke Joseph Smith sitere na ya tụgharịa asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn.