Ihe omimi nile nke Chineke bu ezi-okwu nile nke mụọ nke a matara site nanị na mkpughe. Chineke na-ekpughe ihe omimi ya nile nye ndị ahụ na-erube isi nye ozi-ọma. Ụfọdụ ihe omimi nile nke Chineke ka a ka ga-ekpughe.
Ọbụ unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi nile nke ala-eze nke elu-igwe, Mat. 13:11 .
Asịkwa na m amata ihe omimi nile, ma enweghị m afọ-ọma, abụghị m ihe ọbụla, 1 Ndị-Kọ 13:2 .
Nifaị matara ihe omimi nile dị ukwuu nke Chineke, 1 Nif. 1:1 .
Enyere ya ọtụtụ imata ihe omimi nile nke Chineke, Alma 12:9 .
Ụdị ndị a ka a na-enye ịmata ihe omimi nile nke Chineke, Alma 26:22 .
Ihe omimi nile ndị a, e mebeghị ka m mata ha n’uju, Alma 37:11 .
Enwere ọtụtụ ihe omimi ndị e debere na-ọdịghị onye maara ha ma ọbụghị Chineke n’onwe ya, Alma 40:3 .
Lee ihe omimi nke ndụ iyi-Chineke, ọke ịdị ukwuu ọ dị, OznỌd. 19:10 .
Ọbụrụ na unu ga-arịọ, unu ga-anata mkpughe ma mata ihe omimi nile nke ala-eze, OznỌd. 42:61, 65 (1 Ndị-Kọ 2:7, 11–14 ).
Onye ahụ nke na-edobe iwu-nsọ nile ka a ga-enye ihe omimi nile nke ala-eze, OznỌd. 63:23 .
Nye ha ka m ga-ekpughere ihe omimi m nile, OznỌd. 76:7 .
Ọkwa Nchụ-aja ahụ nke dị ukwuu karịa na-ejide ọtụghe-ụzọ nile nke ihe omimi nile, OznỌd. 84:19 .
N’ọbịbịa ya Onye-nwe ga-ekpughe ihe nzuzo nile nke n’enweghị onye matara ha, OznỌd. 101:32–33 .
Ọkwa nchụ-aja Melkizedek ga-enwe ohere nke inata ihe omimi nile nke ala-eze, OznỌd. 107:19 .