Ohere ahụ dịịrị ndị ahụ bụ ndị nwụworo ọnwụ na-anataghị emume-nsọ nile nke nzọpụta nke ozi-ọma inwe emume-nsọ nile ndị a ka e meere ha n’ime temple nile site n’aka ndị otu Nzukọ-nsọ dị ndụ tozuru-oke. Ndị nwụrụ anwụ ahụ ka a na-akụziri ozi-ọma n’ime ụwa mụọ ma nwere ike inata emume-nsọ nile ahụ e meere ha n’ịnwụ anwụ.
Ndị otu Nzukọ-nsọ kwesịrị ntụkwasị-obi na-achọgharị, kwadobe kwa akụkọ ezi na ụlọ nile iji mata aha nile na ụbọchị nile nke ọmụmụ nke ndị ichie ka e nwee ike metara ha emume-nsọ nile nke nzọpụta.