Ịkpọ-asị, Kpọ-asị Hụ kwa Iro; Ịhụ n’anya; Ọbọ Ịkpọ-asi bụ enweghị mmasị siri ike maka mmadụ ma-ọbụ ihe. Mụ, Chineke, na-ewere oke ajọọ omume nke ndị bụ nna leta ndị bụ ụmụ nke ndị na-akpọ m asị, Ọpụ. 20:5. Ihe isii ndị a ka Onye-nwe kpọrọ-asị, Ilu 6:16. Mmadụ nzuzu na-eleda nne ya anya, Ilu 15:20. E ledara ya anya ma ọ bụkwa onye ndị mmadụ jụrụ-ajụ, Aịsa. 53:3. Na-emere nụ ndị na-akpọ unu asị ihe-ọma, Mat. 5:44. Ọ ga-akpọ otu asị, ma hụ ibe ya n’anya; ma-ọbụ ọ ga-ejide otu, ma lelia ibe ya, Mat. 6:24. Mmadụ nile ga-akpọ unu asị n’ihị aha m, Mat. 10:22. Onye ọbụla nke na-eme ihe-ọjọọ na-akpọ ìhè ahụ asị, Jọn 3:20. E kwela ka onye ọbụla leda okorọbịa ị bụ anya, 1 Tim. 4:12. N’ihi na ha bụ ọgaranya, ha na-eleda ndị ogbenye anya, 2 Nif. 9:30. Eleli kwala mkpughe nile nke Chineke, Jekọb 4:8. Ha nwere ịkpọ-asị ebighi-ebi megide anyị, Jekọb 7:24. Ndị mmadụ kpọrọ ndụmọdụ nile nke Chineke ihe efu ma na-eleda okwu ya nile anya, OznỌd. 3:7. Na-agbanyeghị na a kpọrọ m asị kpagbuo kwa m maka ikwu na m ahụwọ ọ̀hụ́, A—JS 1:25.