Ijikọtaghachị arụ nke mụọ na arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile mgbe a nwụsịrị ọnwụ. Mgbe mbilite n’ọnwụ gasịrị, mụọ ahụ na arụ ahụ a gaghị agbasasị ọzọ, ma onye ahụ ga-aghọ anụ arụ na-anaghị anwụ anwụ. Onye ọbụla a mụrụ n’elu ụwa ga-ebili n’ọnwụ n’ihi na Jisus Kraịst meriri ọnwụ (1 Ndị-Kọ 15:20–22 ).
Jisus Kraịst bụụrụ onye mbụ e bilitere site n’ọnwa n’elu ụwa nke a (Ọlndoz. 26:23 ; Ndị-Kọl. 1:18 ; Mkpu. 1:5 ). Testament Ọhụrụ na-enye aka-ebe pụtara-ìhè na Jisus bilitere jiri arụ nke a na-ahụ anya; ili ya tọgbọ n’efu, o riri azụ na mmanụ an̄ụ, o nweere arụ nke anụ arụ na ọkpụkpọ nile, ndị mmadụ bituru ya aka, ma ndị mụọ-ozi kwuru na o biliwo (Mak 16:1–6 ; Luk 24:1–12, 36–43 ; Jọn 20:1–18 ). Mkpughe ụbọchị ikpeazụ na-emesi-ike ezi-okwu nke mbilite n’ọnwụ nke Kraịst na nke mmadụ nile (Alma 11:40–45 ; 40 ; 3 Nif. 11:1–17 ; OznỌd. 76 ; Moses 7:62 ).
A gaghị ebilite mmadụ nile n’ọnwụ baa n’otu ụdị ebube (1 Ndị-Kọ 15:39–42 ; OznỌd. 76:89–98 ), ma-ọbụghị na a ga-ebilite mmadụ nile n’otu oge ahụ (1 Ndị-Kọ 15:22–23 ; Alma 40:8 ; OznỌd. 76:64–65, 85 ). Ọtụtụ Ndị-nsọ ka e bilitere mgbe mbilite n’ọnwụ Kraịst gasịworo (Mat. 27:52 ). A ga-ebilite ndị ezi-omume na mbilite n’ọnwụ nke mbụ tutu ndị ajọọ omume apụta site n’ili (1 Ndị-Tes. 4:16 ); Ndị mmehie na-enweghị nchegharị ga apụta na mbilite n’ọnwụ nke ikpe-azụ Mkpu. 20:5–13 ; OznỌd. 76:85 ).
Ọbụnadị na e mebisiri arụ nke a, ọ bụ n’anụ arụ m ka m ga-ahụ Chineke, Job 19:26 (Moses 5:10 ).
M ga-emeghe ili nile unu, mee ka unu si n’ili rigopụta, Ezik. 37:12 .
Ili meghekwara, ma arụ ọtụtụ ndị biliri, Mat. 27:52–53 (3 Nif. 23:9 ).
Onye-nwe e siwo n’ọnwụ bilie, Luk 24:34 .
Mụọ enweghị anụ arụ na ọkpụkpụ nile, otu unu hụrụ na mụ nwere, Luk 24:39 .
A Bụ M mbilite n’ọnwụ na ndụ, Jọn 11:25 .
Ndị-ozi Iri na Abụọ kuziri na Jisus e siwo n’ọnwụ bilie, Ọlndoz. 1:21–22 (Ọlndoz. 2:32 ; 3:15 ; 4:33 ).
N’ime Kraịst ka a ga-eme ka mmadụ nile dịrị ndụ, 1 Ndị-Kọ 15:1–22 .
Ndị nwụrụ anwụ n’ime Kraịst ga-ebu ụzọ si n’ọnwụ bilie, 1 Ndị-Tes. 4:16 .
Ngọzị na ịdị nsọ na-adịrị ya bụ onye nwere oke n’ime mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ, Mkpu. 20:6 .
Kraịst tọgbọrọ ndụ ya, ma were kwa ya ọzọ, ka o nwee ike iweta na mmezu mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, 2 Nif. 2:8 (Mosa. 13:35 ; 15:20 ; Alma 33:22 ; 40:3 ; Hil. 14:15 ).
Ọbụrụ na mbilite n’ọnwụ adịghị, anyị ga-anọzi n’okpuru ekwensu, 2 Nif. 9:6–9 .
Mbilite n’ọnwụ ga-agafetere mmadụ nile, 2 Nif. 9:22 .
Abịnadaị kụziri banyere mbilite n’ọnwụ nke mbụ, Mosa. 15:21–26 .
Ndị ajọọ mmadụ na-anọgide dịka a ga-asị na ọdịbeghị mgbapụta ọbụla e mere, ma ọbụghị ịtọpụ n’agbụ nile nke ọnwụ, Alma 11:41–45 .
Alma kọwara ọnọdụ nke mkpụrụ-obi nile n’etiti ọnwụ na mbilite n’ọnwụ, Alma 40:6, 11–24 .
N’ọbịbịa nke Onye-nwe, ndị nwụrụ anwụ bụ ndị nwụrụ n’ime Kraịst ga-apụta, OznỌd. 29:13 (OznỌd. 45:45–46 ; 88:97–98 ; 133:56 ).
Unu ga-akwa akwa maka ndị ahụ na-enweghị olile-anya maka mbilite n’ọnwụ nke ebube, OznỌd. 42:45 .
Ndị ahụ na-amaghị iwu ọbụla ga-enwe oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ a, OznỌd. 45:54 .
Ha ga-ebili site na ndị nwụrụ anwụ, ha agaghị anwụkwa ma e mesịa, OznỌd. 63:49 .
Mbilite n’ọnwụ site na ndị nwụrụ anwụ bụ mgbapụta nke mkpụrụ-obi, OznỌd. 88:14–16 .
Mụọ na ihe nile e jiri mee ihe, e jikọtara ọnụ na-enweghi nkewa, na-anata uju nke on̄u, OznỌd. 93:33 .
Mụọ-ozi nile bụ ndị mmadụ bilitere n’ọnwụ nwere arụ nile nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile, OznỌd. 129:1 .
Ihe ọbụla bụ ogo akọ na uche anyị toruru na ndụ nke a ga-anọrọ n’ime anyị na mbilite n’ọnwụ, OznỌd. 130:18–19 .