Nri anyasị ikpe-azụ Hụ kwa Ngabiga; Oriri-nsọ Dịka Testament Ọhụrụ, nri ikpe-azụ nke Jisus riri tutu njide ya na mkpọgide n’obe ya (Luk 22:14–18). Ya na Ndi-Ozi Iri na Abụọ ya riri nri a n’oge ngabiga (Mat. 26:17–30; Mak 14:12–18; Luk 22:7–13). Onye-nzọpụta gọziri achịcha na mmanya ma nye ya Ndị-Ozi, Mat. 26:26–29 (Mak 14:22–25; Luk 22:7–20). Jisus sachara ụkwụ nke Ndi-ozi, Jọn 13. Judas ka a kpọrọ aha dịka onye ga-arara Jisus nye n’ụzọ aghụghọ, Jọn 13:21–26 (Mat. 26:20–25).