Ebube Telestial Hụ kwa Ogo nile nke ebube Nke kachasị ịdị-ala n’ogo ebube atọ ahụ nke ndị mmadụ ga-ebi n’ime ya mgbe e kpesịrị ikpe nke ikpe-azụ. Pọl hụrụ otu ebube nke kpakpando nile, 1 Ndị-Kọ 15:40–41. Joseph Smith na Sidney Rigdon hụrụ ebube nke telestial, OznỌd. 76:81–90. Ndị nile bi n’ụwa telestial ahụ enweghị ngụta dịka kpakpando nile dị, OznỌd. 76:109–112. Onye ahụ nke na-enweghị ike idebe iwu ahụ nke ala-eze telestial e nweghị ike idebe ebube nke telestial, OznỌd. 88:24, 31, 38.